Matthew 5:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu apụtaghị ìhè karịa ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị iketa alaeze eluigwe ma ọlị.
Igbo 2006
N'ihi na asim unu, na ọ buru na ezi omume-unu adighi-akari ezi omume ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nke-uku, unu agaghi-abà n'ala-eze elu-igwe ma-ọli.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị.