Matthew 5:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ana m asị unu, ọ bụrụ na iwe ewee gị megide nwanne gị, ị na-edo onwe nꞌọnọdụ onye a ga-ekpe ikpe. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ nwanne gị onye iberibe, ma ọ bụ onye nzuzu, ị na-enye onwe gị nꞌaka ịba nꞌọkụ ala mmụọ.
Igbo 2006
ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘ Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’ na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ.