Matthew 5:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mee ọsịịsọ ka gi na onye iro gị kpezie mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nꞌaka okpe ikpe onye ga-enyefe gị nꞌaka ndị ga-etinye gị nꞌụlọ mkpọrọ.
Igbo 2006
Me ka gi na onye nēkuru gi ga ikpé me eyì ọsọsọ, mb͕e gi na ya nọ n'uzọ; ka onye ahu nēkuru gi ga ikpe we ghara irara gi nye n'aka onye-ikpe ma eleghi anya, onye ikpe arara kwa gi nye n'aka onye nēje ozi, ewe tubà gi n'ulo-nkpọrọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mee ọsịịsọ ka gị na onye kpọ gị eje ụlọ ikpe kpezie, mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nʼaka ọkaikpe, onye ga-enyefe gị nʼaka ndị nche, ma eleghị anya etinye gị nʼụlọ mkpọrọ.