Matthew 5:29 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na anya gị achọọ iduba gị na mmehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu anya baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji anya abụọ baa nꞌọkụ ala mmụọ.
Igbo 2006
Ma ọ buru na anya aka-nri gi eme gi ka i ma n'ọnyà, ghupu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aghara kwa itubà aru-gi dum n'ọku ala-mọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị baa nʼalaeze karịa na i ji ahụ zuruoke baa nʼọkụ ala mmụọ.