Matthew 5:30 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na aka nri gị achọọ ime ka i mehie, gbupu ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu aka baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji aka abụọ baa nꞌọkụ.
Igbo 2006
Ma ọ buru na aka-nri-gi eme gi ka i ma n'ọnya, bipu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aru-gi dum ghara kwa ije n'ọku ala-mọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ.