Matthew 6:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ọ bụrụ na echiche ọjọọ na ọchịchọ ọjọọ gị ekpuchie anya gị, gbochie ya ịbụrụ gị ìhè, ị ga-anọ nꞌọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adịkwa ukwuu!
Igbo 2006
Ma ọ buru na anya-gi jọrọ njọ, aru-gi dum gējuputa n'ọchichiri. Ya mere, ọ buru na ìhè nke di nime gi bu ọchichiri, le ka ọchichiri ahu si di oké ibù!
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na anya gị ajọọ njọ, akụkụ ahụ gị niile ga-ejupụta nʼọchịchịrị. Ọ bụrụkwa na ìhè ahụ dị nʼime gị aghọọ ọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adị ukwuu.