Matthew 6:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Nꞌihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-eri, ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụkwanụ uwe unu ga-eji kpuchie ahụ unu. Ndụ karịrị ihe e ji azụ ya.
Igbo 2006
N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri, ma-ọbu ihe unu gāṅu; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. Ọ̀ bughi ndu kariri ihe eji azù ya, ọ̀ bughi kwa aru kariri uwe-oyiyi-ya?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ ihe unu ga-aṅụ, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi nʼahụ. Ọ bụ ndụ akarịghị nri eji azụ ya, ka ọ bụ ahụ akarịghị ihe e ji ekpuchi ya?