Matthew 6:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịma atụ. Ha adịghị echegbu onwe ha banyere ihe oriri. Ọ dịghị mgbe ha na-akụ mkpụrụ nꞌubi ọ dịkwaghị mgbe ha na-ewe mkpụrụ nꞌubi. Ma Nna unu bi nꞌeluigwe na-azụ ha. Ọ̀ bụ na unu adịghị oke ọnụ ahịa karịa ha?
Igbo 2006
Lenu anu-ufe nke elu-igwe, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewè kwa ihe-ubi, ha adighi-ekpokọta kwa ihe ba n'ọba; ma Nna-unu nke elu-igwe nāzù ha. Ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari ha?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịmaatụ. Ha adịghị akụ mkpụrụ nʼubi maọbụ ewe ihe ubi. Ha adịghị achịkọtakwa ihe debe nʼọba. Ma Nna unu nke bi nʼeluigwe na-azụ ha. Ọ bụ na unu adịghị oke ọnụahịa karịa ha?