Matthew 6:32 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-atụfu oge ha iche ihe banyere ihe ndị a. Ọ bụkwa ha ka ihe ndị a na-agụbiga agụụ oke. Kama tụkwasịnụ Chineke obi unu, nꞌihi na ọ maara mkpa unu nile.
Igbo 2006
N'ihi na ihe ndia nile ka ndi mba ọzọ nāchọ; n'ihi na Nna-unu nke elu-igwe nāmata na ihe ndia nile di unu nkpà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ihe ndị a ka ndị na-amaghị Chineke na-achọsi ike. Ma Nna unu bi nʼeluigwe maara na ọ dị unu mkpa.