Matthew 8:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌoge anyasị, ha kpọtaara ya ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ nile, gwọọkwa ọtụtụ ndị ọzọ ahụ na-esogbu.
Igbo 2006
Ma mb͕e o ruru anyasi, ha kutara Ya ọtutu madu ndi mọ ọjọ ji: O we were okwu-ọnu chupu ndi-mọ ahu, me kwa ndi nile aru nādighi nma ka aru-ha di ike:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge uhuruchi, ha kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. O ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ niile, gwọọkwa ndị niile ahụ na-adịghị ike.