Matthew 8:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Jisọs hụrụ na ndị mmadụ dị ukwuu gbara ya gburugburu, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Jikerenụ ka anyị gafee osimiri!”
Igbo 2006
Ma mb͕e Jisus huru na ọtutu ìgwè madu di Ya buruburu, O kwuru ka ha gabiga n'ofè ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ndị gbara ya gburugburu, ọ nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gafee nʼofe nke ọzọ.