Matthew 8:28 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Emesịa, ha rutere obodo Gadarin, nke dị nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ. Nꞌebe ahụ, e nwere mmadụ abụọ bi nꞌebe a na-eli ozu. Ọ dịkwaghị onye na-esite ụzọ ahụ agafe, nꞌihi na ha na-akpa ike nke ukwuu.
Igbo 2006
Mb͕e Ọ gabigasiri n'ofè ọzọ n'ala ndi Gadara, ndikom abua ndi mọ ọjọ ji we zute Ya, ndi nēsi n'ebe anēlì ozu puta, ndi anya-ha di oké egwu, ya mere ọ dighi onye ọ bula nwere ike igabiga uzọ ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe o rutere nʼofe nke ọzọ nke obodo Gadarin, mmadụ abụọ ndị mmụọ ọjọọ si nʼebe a na-eli ozu zutere ya. Ha na-akpa ike nke ukwuu, na ọ dịkwaghị onye na-esite nʼụzọ ahụ agafe nʼihi ha.