Matthew 8:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Dị ka ọchịagha nke m bụ, ọ bụrụ na m asị onye agha nọ nꞌokpuru m bịa, ọ na-abịa, nꞌihi na ọ nọ nꞌokpuru m. Ma i nwere ike karịrị nke a ịchụpụ ọrịa ahụ na-enye ohu m nsogbu.”
Igbo 2006
N'ihi na mu onwem bu kwa onye nọ n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, ‘gaa.’ Ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ, ‘bịa.’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a.’ Ọ na-emekwa ya.”