Matthew 9:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ndị Farisii hụrụ Jisọs ka o so ndị a na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere nna unu ukwu ji eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri nri?”
Igbo 2006
Mb͕e ndi-Farisi huru ya, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ìhi gini ka Onye-ozizí-unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia eri ihe?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eri nri?”