Matthew 9:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Jisọs nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi nꞌetiti ndị Juu bịara kpọọ isi ala nye ya sị ya, “Ọ dịbeghị anya kemgbe nwa m nwanyị nwụrụ. Ọ bụrụ na ị ga-abịa metụ ya aka ọ ga-ebili dịrịkwa ndụ ọzọ.”
Igbo 2006
Mb͕e Ọ nāgwa ha okwu ndia, le, otù onye-isi biara, we kpọ isi ala nye Ya, si, Nwam nwayi anwuruwo ọbuná ub͕u a: otú ọ di, bia bikwasi ya aka-Gi, na ọ gādi ndu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi ụlọ ekpere bịara kpọọ isiala nye ya, sị, “Ọ dịbeghị anya nwa m nwanyị nwụrụ. Otu ọ dị, bịa ka ị bikwasị ya aka gị. Ọ ga-ebili dịkwa ndụ ọzọ.”