Matthew 9:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ dịghị anya ụfọdụ ndị ikom ji ute butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe dị nꞌime ndị buteere ya nwoke a, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nꞌihi na agbagharala m gị mmehie gị nile.”
Igbo 2006
Ma le, ha butere Ya onye akuku-aru-ya nwuru anwu, tọb͕ọrọ n'ihe-ndina: mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, nwe obi-ike; anāb͕aghara gi nmehie-gi nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile.”