Matthew 9:33 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ nꞌahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a na ndụ anyị nile.”
Igbo 2006
Mb͕e achupusiri mọ ọjọ ahu, onye-ob͕i ahu we kwue okwu: ibobo we nwua ìgwè madu nile n'aru, ha si, Ọ dighi mb͕e ọ bula egosiri ya otú a n'Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a nʼala Izrel.”