Matthew 9:36 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ nile na-abịakwute ya, o nwere ọmiko nꞌahụ ha, nꞌihi na ha bụ ndị a na-esogbu, ndị na-enweghị onye inyeaka, ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.
Igbo 2006
Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu nile, O nwere ọmiko n'aru ha, n'ihi na anēsob͕u ha, nāchusa kwa ha, dika aturu nēnweghi onye nāzù ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ niile na-abịakwute ya, ọmịiko ha mere ya, nʼihi na ha bụ ndị a na-esogbu. Ndị na-enweghị onye inyeaka. Ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.