Micah 7:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ahuhu dirim! n'ihi na Adiwom ka mb͕e ha ghọkọtaworo nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru, dika ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke ọghughọ-nkpuru-vine: ọ dighi otù uyọkọ nkpuru-vine fọduru iri; nkpuru-osisi fig nke buru uzọ cha ka nkpuru-obim chọsiworo ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ahụhụ dịrị m! Adị m ka onye na-achịkọta mkpụrụ osisi vaịnị nʼọkọchị, mgbe a ghọkọtachara mkpụrụ dị nʼubi vaịnị. O nweghị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ọbụla fọdụrụ nke e nwere ike ịta, o nwekwaghị mkpụrụ fiig buru ụzọ chaa nke agụ ya na-agụsị m ike