Nahum 3:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēkpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi n'iru-gi, me ka mba nile hu ọtọ-gi, na ala-eze nile ka ha hu ihere-gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị. Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile.