Nehemiah 12:27 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma n'ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke ha chọputara ndi Livai n'ebe-ha nile, ime ka ha biarue Jerusalem, ime ememe nke ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke, ọbuná n'iṅuri-ọṅu, na n'ikele-ekele, na n'ibù-abù, n'ájà na une na n'ubọ-akwara.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe a na-edo mgbidi Jerusalem ọhụrụ ahụ nsọ, e sitere nʼobodo niile ndị Livayị bi kpọọ ha ka ha bịa nye aka iji ọṅụ mee mmemme ido nsọ ahụ. Ha bịakwara jiri abụ ekele na ihe egwu dị iche iche dịka ụbọ akwara, ịgba na une kelee Chineke.