Nehemiah 12:44 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ewe me ndikom ufọdu n'ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n'uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n'ihi na ọṅù Juda di n'ihi ndi-nchu-àjà na n'ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ahụ ka a họpụtara ndị ikom na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe, ebe a na-achịkọba onyinye mkpụrụ mbụ, na onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri. A na-esite nʼobodo gbara Jerusalem gburugburu na-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe onyinye niile e nyere nʼiwu maka ọdịmma ndị nchụaja na ndị Livayị. E si otu a na-ewebata ya nʼihi na ọrụ ndị nchụaja na ndị Livayị na-arụ na-atọ ndị Juda ụtọ nke ukwuu.