Nehemiah 13:25 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Mu na ha we se okwu, m'we kọcha ha, tie ufọdu nime ha aka, kwopu agiri-isi-ha, me ka ha were Chineke ṅua iyi, si, Unu ewela umu-unu ndinyom nye umu-ha ndikom, unu aluta-kwa-lara umu-unu ndikom, ma-ọbu onwe-unu, umu-ha ndinyom.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, abaara m ha mba, bụkwaa ha ọnụ. Ụfọdụ ha ka m tiri ihe, dọọkwa ha nʼagịrị isi. Emesịa, emere m ka ha ṅụọ iyi nʼaha Chineke si: “Unu agaghị ekwekwa ka ụmụ ndị ikom na ndị inyom unu lụọ ndị mba ọzọ ma unu onwe unu agakwaghị alụtara ụmụ unu, maọbụ onwe unu, ndị inyom ndị mba ọzọ.