Nehemiah 2:7 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
M'we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enyem akwukwọ-ozi inye ndi nāchi ala n'ofè osimiri, ka ha kwe ka m'gabiga rue mb͕e m'batara Juda;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, asịrị m ya, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, aga m achọ ka i nye m akwụkwọ nke m ga-enye ndịisi ọchịchị niile nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, ka ha kwere ka m site nʼobodo ha gafee ruo mgbe m ga-eru na Juda.