Nehemiah 3:14 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia ka Malkija nwa Rikab, bú onye-isi ala di Bet-hakerem buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Malkija nwa Rekab, onyeisi ọchịchị ala nke dị Bet-Hakerem gburugburu, bụ onye wuziri ọnụ ụzọ ama dị nʼebe ikpofu ahịhịa. O tinyere ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.