Nehemiah 4:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O kwue okwu n'iru umu-nne-ya na usu-ndi-agha Sameria, si, Gini ka ndi-Ju ndia ndi nāta aru nēme? hà gārapuru onwe-ha ihe? hà gāchu àjà? hà gēme ka ọlu-ha gwusia n'otù ubọchi? hà gēsi n'obo ájá me ka nkume di adi ọzọ, ebe nkume ahu nile bu ihe akpọworo ọku?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihu ndị otu ya na ndịisi agha Sameria, o kwuru si, “Gịnị ka ndị Juu ole na ole a na-adịghị ike na-eme? Ha na-achọ iwugharị mgbidi obodo a? Ha ga-achụ aja? Ha ga-arụcha ọrụ niile nʼotu ụbọchị? Ha ga-esita nʼaja a kụpịasịrị akụpịa mee ka nkume ndị a dị ndụ, ka ọ bụ site na nkume ochie ndị a akpọrọ ọkụ?”