Nehemiah 4:22 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọzọ, na mb͕e ahu m'siri ndi-ayi, Ka nwoke ọ bula na onye nējere ya ozi nọ ọnọdu-abali n'etiti Jerusalem, ka ha we buru ayi ndi-nche n'abali, je kwa ozi n'ehihie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Agwara m ndịisi ọrụ niile okwu sị ha na onyeisi ọrụ ọbụla na ndị na-enyere ya aka nʼọrụ ga na-anọ na Jerusalem nʼabalị niile. Nʼụzọ dị otu a, ndị ọrụ ga-arụ ọrụ ha nʼoge ihe dị, ma ha ga-anọkwa na nche nʼabalị.