Nehemiah 8:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Nehemaia, nke ya onwe-ya bu Tiashata, na Ezra onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ, na ndi Livai, bú ndi nēzí ndi ahu ihe, we si ndi ahu nile, Ta, ihe nsọ nke diri Jehova, bú Chineke-unu, ka ọ bu; unu erula újú, akwa-kwa-la ákwá. N'ihi na ndi ahu nile nākwa ákwá, mb͕e ha nuru okwu nile nke iwu ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Nehemaya, onyeisi ọchịchị, na Ezra, ode akwụkwọ na onye nchụaja, na ndị Livayị ahụ na-atụziri ndị mmadụ ihe, gwara ndị ahụ niile sị: “Taa bụ ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị, Chineke unu. Unu erula ụjụ maọbụ bee akwa.” Nʼihi na ha niile na-akwa akwa mgbe ha na-ege ntị nʼokwu niile nke iwu ahụ.