Nehemiah 9:25 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha we were obodo di iche iche ewusiri ike, na ala nwere ume, ha nweta-kwa-ra ulo juputara n'ezi ihe nile, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, na ubi-vine, na ubi-olive, na ọtutu osisi nāmi nkpuru anēri eri: ha we rie ihe, afọ ju-kwa-ra ha, ha we gba abuba, ezi ihe uku Gi we tọ ha utọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị gị nwetara ala mara mma, na ọtụtụ obodo e wusiri ike; ha nwetakwara ọtụtụ ụlọ nke ihe ọma juru nʼime ha, na olulu mmiri e gwuru nke ọma, na ubi vaịnị mkpụrụ dị, na ubi oliv, na ọtụtụ osisi ọma ndị ọzọ na-amị mkpụrụ. Ha rijuru afọ, ahụ ha mara mma ile anya, ha ṅụrikwara ọṅụ nʼihi ngọzị ị gọziri ha.