Nehemiah 9:27 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
I we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we kpab͕ue ha: ma na mb͕e nkpab͕u-ha, ha we tikue Gi, Gi onwe-gi we site n'elu-igwe nu, nye ha ndi-nzọputa dika ọtutu obi-ebere-Gi nile si di, ha we zọputa ha n'aka ndi nākpab͕u ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha, ndị kpagburu ha. Ma nʼime mkpagbu ha, ha kpọkuru gị, ị nọkwa nʼeluigwe nụ ekpere ha, sitekwa nʼobi ebere gị zigara ha ndị bịara zọpụta ha, na ndị napụtara ha site nʼaka ndị iro ha.