Numbers 1:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ọ bu kwa nzukọ Israel nile ka ha kpọkọtara n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-abua, ha we kọ akukọ osuso-ọmumu-ha dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye na isi-ya onye na isi-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emesịa, ha kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile ka ha zukọọ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa abụọ. Ndị niile zukọrọ kọwara ikwu ha na ezinaụlọ ha si pụta nʼotu na otu. Ma ndị ikom niile gbara site nʼiri afọ abụọ gbagoo ka e denyere aha ha nʼakwụkwọ nʼotu na otu,