Numbers 11:16 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Jehova we si Moses, Chikọtaram ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye Israel, ndi i maworo na ha onwe-ha bu ndi-okenye nke ndi Israel, na ndi nēle ha anya n'ọlu: gi chiri ha bia rue ulo-ikwū nzute, ka ha we soro gi guzo onwe-ha n'ebe ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpọkọta iri ndị okenye ụmụ Izrel asaa, ndị ị maara na ha bụ ndị ndu, na ndị nlekọta ije ozi nʼetiti ụmụ Izrel. Kpọta ha nʼụlọ nzute m ka ha soro gị guzoro.