Numbers 15:24 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
ọ gēru kwa, ma ọ buru na emewo ya n'amaghi-ama, n'ebe anya nzukọ Israel nērughi, na nzukọ ahu nile gēme otù nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova, ya na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-Ihe-ọṅuṅu-ya, dika ikpé-ya si di, na otù nkpi iji chu àjà-nmehie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na e mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụ na ọgbakọ ụmụ Izrel amaghị ama mee ya, mgbe ahụ, ọgbakọ ụmụ Izrel ga-eji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, aja na-esi isi ụtọ nke Onyenwe anyị na-anabata. Aghaghị iwetakwa mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ nke ya na aja ahụ so, tinyere otu mkpi maka aja mmehie.