Numbers 16:40 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
iburu umu Israel ihe-ncheta, ka nwoke ala ọzọ onye nēsiteghi na nkpuru Eron, we ghara ibia nso isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova; ka ọ ghara idi ka Kora, di kwa ka nzukọ-ya: dika Jehova gwara ya okwu n'aka Moses.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru Onyenwe anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha.