Numbers 16:5 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
o we gwa Kora, gwa kwa nzukọ-ya nile, okwu, si, N'ututu Jehova gēme ka amara ndi O nwere, na onye di nsọ, na onye Ọ gēme ka ọ biarue nso Ya: Onye Ọ gārọputa, onye ahu ka Ọ gēme kwa ka ọ biarue nso Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ọ gwara Kora na ndị niile sonyeere ya, sị, “Nʼụtụtụ echi, Onyenwe anyị ga-eme ka amara ndị bụ ndị ya na onye dị nsọ. Ọ ga-eme ka onye ahụ bịaruo ya nso. Onye ọ ga-ahọpụta ka ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo ya nso.