Numbers 17:8 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue n'echi-ya, na Moses bara n'ulo-ikwū nke ihe-àmà; ma, le, nkpa-n'aka Eron nke diri ulo Livai amawo ifuru, b͕awa kwa ifuru ahu, wa kwa okoko, mì kwa almond chara acha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼechi ya, Mosis banyere nʼụlọ nzute Ihe Ama ahụ chọpụta na ọ bụghị naanị na mkpanaka Erọn, onye nọchitere anya ebo Livayị, amaala ifuru, kama na ọ waala okoko ma mịakwa mkpụrụ osisi chara acha a na-akpọ alụmọnd.