Numbers 18:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nka bu kwa nke gi, àjà-nbuli nke onyinye-ha, ọbuná-àjà-ofufé nile nke umu Israel: gi ka M'nyeworo ha, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n'ukpuru ebighi-ebi onye ọ bula nke di ọcha n'ulo-gi gēri ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nke a bụkwa nke gị: Ihe ọbụla nke ewezugara site nʼonyinye nke aja mfufe niile nke ndị Izrel wetara. Mụ onwe m na-ewere nke a nye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Onye ọbụla nke dooro onwe ya ọcha nʼezinaụlọ nwere ike iri ya.