Numbers 18:17 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma otú ọ di, nwa ehi buru uzọ mu, ma-ọbu nwa aturu buru uzọ mu, ma-ọbu nwa ewu buru uzọ mu, i gaghi-ab͕aputa ha; ihe nsọ ka ha bu: i gāwusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjàm, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku, ime ihe ísì utọ anēsurere Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma a gaghị agbara nwa ehi mbụ, maọbụ nwa atụrụ mbụ maọbụ nwa ewu mbụ. Ha dị nsọ. Fesa ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, ma kpọọ abụba ha ọkụ dịka onyinye e nyere site nʼọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.