Numbers 18:8 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Jehova we gwa Eron okwu, si, Ma Mu onwem, le, enyewom i ihe-ndebe nke àjà-nbulim nile, bú nke diri ihe nile edoro nsọ nke umu Israel, gi ka M'nyeworo ha ibu òkè otite-manu, nye kwa umu-gi ndikom, n'ukpuru ebighi-ebi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Mụ onwe m emeela gị onye nlekọta onyinye niile a na-eche nʼihu m, onyinye niile dị nsọ nke ụmụ Izrel wetara m ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom dịka oke ruuru unu site nʼụkpụrụ ebighị ebi.