Numbers 18:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nka gābu nke gi site n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, site n'ọku: onyinye-ha ọ bula iji biaru nso, ọbuná onyinye-inata-iru-ọma-ha ọ bula, na àjà-nmehie-ha ọ bula, na àjà-ikpe-ọmuma-ha ọ bula, nke ha gēnyeghachim, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ gāburu gi, buru kwa umu-gi ndikom.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu ga-enwere akụkụ aja ahụ kachasị nsọ nke a na-edopụ iche site nʼọkụ. Site nʼonyinye niile nke a na-ewetara m, bụ onyinye mkpụrụ ọka maọbụ aja mmehie maọbụ aja ikpe ọmụma, ndị ahụ a na-edopụ iche dịka ihe kachasị nsọ, ha ga-abụ oke gị na ụmụ gị ndị ikom.