Numbers 19:18 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
nwoke nke di ọcha gēwere kwa hyssop, sue ya na miri ahu, fesa ya n'ulo-ikwū ahu, na n'ihe-ya nile, na n'aru ndi nọ n'ebe ahu, na n'aru onye ahu nke metuworo ọkpukpu ahu, maọbu onye eb͕uru eb͕u ahu, ma-ọbu onye nwuru anwu ahu, maọbu ílì ahu, aru:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, nwoke nke nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha ga-ewere ụfọdụ hisọp, denye ya na mmiri ahụ fesaa ya nʼime ụlọ ikwu ahụ, na ngwongwo niile e ji dozie ụlọ ahụ, na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya nʼahụ onye ọbụla metụrụ ọkpụkpụ, maọbụ onye e gburu egbu, maọbụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ili aka.