Numbers 20:19 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Umu Israel we si ya, Ọ bu n'uzọ atuliri atuli ka ayi gārigo: ọ buru kwa na ayi aṅua miri-gi, mu onwem na anu-ulom, m'gēnye kwa gi ọnu-ahia-ya: nání ka m'were ukwum gabiga, ọ dighi ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya, “Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.”