Numbers 21:18 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Olùlù-miri, ndi-isi gwuru ya, Ndi amara aha-ha nke ndi Israel doziri ya, Ha ji nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru, ji kwa nkpa-n'aka nile ha, me ya. Ha si n'ọzara ahu jerue Matana:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Olulu mmiri ụmụ ndị eze gwuru nke ndị ndu anyị doziri. Mkpara eze ha na mkpara ha, ka ha ji gwuo ya.” Emesịa, ha hapụrụ ọzara ahụ, gaa nʼihu ruo nʼobodo Matana.