Numbers 21:23 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma Saihon ekweghi ka Israel gabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, pua izute Israel rue ọzara, biarue Jehaz: ọ we buso Israel agha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Saịhọn ekweghị na ụmụ Izrel ga-esi nʼoke ala ya gafee. Ọ chịkọtara ndị agha ya niile, zọpụ ije ibu agha megide ndị Izrel nʼime ọzara ahụ. Mgbe o rutere Jehaz, ọ lụsoro Izrel agha.