Numbers 28:26 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọzọ, n'ubọchi nkpuru mbu, mb͕e unu nēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma ọhu n'ememe izú asa nke ubọchi asa unu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Nʼụbọchị mbụ nke mkpụrụ mbụ, mgbe unu na-eche onyinye ọka ọhụrụ unu nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme Izu Asaa, nweenụ mkpọkọta dị nsọ. Unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.