Numbers 31:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma unu onwe-unu, manu ulo-kwū-unu n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: onye ọ bula nke b͕uworo madu, na onye ọ bula nke metuworo onye eb͕uru eb͕u aru, wepunu nmehie n'aru-unu n'ubọchi nke-atọ na n'ubọchi nke-asa, unu onwe-unu na ndi unu dọtaworo n'agha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma ugbu a, unu niile bụ ndị soro gbuo mmadụ, maọbụ bitụ ozu ha aka, unu abatala nʼime ogige Izrel tutu ụbọchị asaa agafee. Nʼoge a, doonụ onwe unu ọcha, dokwaanụ ndị niile unu dọtara nʼagha ọcha, nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa.