Numbers 31:50 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ayi ewetawo kwa nso ihe iji biaru nso Jehova, ihe nwoke ọ bula chọtaworo, ihe ọla-edo, bú iyab͕a-ukwu, na ọla-aka, na nb͕a-aka-akàrà, na nb͕a-aka-nti, na ihe anēyi n'olu, ikpuchiri nkpuru-obi-ayi nmehie-ha n'iru Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, anyị wetaara Onyenwe anyị onyinye site nʼihe anyị kwatara nʼagha. Onyinye anyị bụ ihe onye ọbụla nwetara, ihe ọlaedo a na-agba nʼụkwụ na mgbaaka, na ọlaaka ikike, na ọlantị na ihe iyi nʼolu niile, i ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onwe anyị nʼihu Onyenwe anyị.”