Numbers 32:33 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Moses we nye ha, bú umu Gad, na umu Reuben, na nkera ebo Manase nwa Josef, ala-eze Saihon, bú eze ndi-Amorait, na ala-eze Og, bú eze Beshan, ala ahu, dika obodo-ya nile si di n'ókè-ala nile ha, bú obodo nile nke ala ahu buruburu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mosis nyere ndị ebo Gad, na Ruben, na ọkara Manase nwa Josef, alaeze niile Saịhọn eze Amọrị nakwa alaeze niile nke Ọg, eze ndị Bashan na-achị. O nyere ha ala ahụ niile, na obodo niile dị nʼala ahụ gburugburu.