Numbers 33:52 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
unu gānapu kwa n'aka ndi nile bi n'ala ahu ala-ha n'iru unu, unu gāla kwa nkume-ha nile nke emere ka ha yie ihe n'iyi, onyinyo-ha nile awuru awu ka unu gāla kwa n'iyì, me kwa ka ebe di elu nile tọb͕ọrọ n'efu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
unu aghaghị ịchụpụ ndị niile bi nʼebe ahụ ma bibie chi niile ha na-efe, ndị ha ji nkume tụọ na ndị ha kpụrụ akpụ. Unu ga-ebibikwa ebe niile dị nʼelu ugwu niile, ebe ha na-anọ efe arụsị ha niile ofufe.