Numbers 4:15 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma mb͕e Eron na umu-ya ndikom kpuchisiri ebe nsọ ahu, na ihe nile nke ebe nsọ ahu, nime nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū; emesia, umu Kohat gābia ibū ya: ma ha agaghi-emetu ebe nsọ ahu aka, ha we ghara inwu. Ihe ndia bu ibu umu Kohat n'ulo-ikwū nzute.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe Erọn na ụmụ ya kpuchisịrị ụlọnsọ ahụ na ngwongwo niile nke ebe nsọ ahụ, dịka ndị Izrel niile na-ejikere ibili ije, mgbe ahụ ka ndị Kohat ga-abata buru ihe ndị a. Ma ha agaghị emetụ ihe nsọ ndị a aka ka ha ghara ịnwụ. Ọrụ ibu ihe ndị a niile dị nʼime ụlọ nzute dịrị Ndị Kohat.